Pular para o conteúdo
Publicidade

Isaías 43

Onye nzọpụta ndị Izrel nwere

1 Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,

bụ onye kere gị, Jekọb,

na onye kpụrụ gị Izrel,

"Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị.

Akpọọla m gị aha, bụkwa nke m.

2 Mgbe si na mmiri dị omimi na-agafe,

aga m anọnyere gị.

Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,

agaghị m ekwe ka o bufuo gị.

Mgbe na-eje ije nʼime ọkụ,

gaghị eregbu gị.

Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.

3 Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,

Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.

Ewerela m Ijipt

na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị.

Veja também