Onye nzọpụta ndị Izrel nwere
1 Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,
bụ onye kere gị, Jekọb,
na onye kpụrụ gị Izrel,
"Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị.
Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m.
2 Mgbe ị si na mmiri dị omimi na-agafe,
aga m anọnyere gị.
Mgbe i si na mmiri nke na-ekwo oke okwukwo,
agaghị m ekwe ka o bufuo gị.
Mgbe ị na-eje ije nʼime ọkụ,
ọ gaghị eregbu gị.
Ire ọkụ ahụ agakwaghị erepịa gị.
3 Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
Onye nzọpụta gị, na Onye nsọ nke Izrel.
Ewerela m Ijipt
na Kush na Seba nye ka ha bụrụ ihe i ji gbara onwe gị.