19 Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị,
sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya.
Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri
nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.59:19 Maọbụ, mgbe onye iro ga-abata dịka idee mmiri, mmụọ nke Onyenwe anyị ga-ebuli ọkọlọtọ imegide ya.