Publicidade

Isaías 61

Afọ ngosi ihuọma Onyenwe anyị

1 Mmụọ nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dị nʼahụ m,

nʼihi na Onyenwe anyị eteela m mmanụ

ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.

O zitela m ịkasị ndị obi ha tiwara etiwa obi,

ikwupụta inwere onwe nye ndị a dọtara nʼagha,

na ntọghapụ site nʼọchịchịrị nye ndị mkpọrọ.61:1 Imeghe anya ndị kpuru ìsì

2 O zitere m ikwupụta afọ mgbe Onyenwe anyị ga-eji ihuọma leta ndị mmadụ,

na ụbọchị ịbọ ọbọ nke Chineke anyị.

O zitekwara m ịkasị ndị niile na-eru ụjụ obi,

3 na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha.

O zitere m inye ha okpueze mara mma

nʼọnọdụ ntụ,

inye ha ọṅụ,

nʼọnọdụ ịkwa akwa,

na iyikwasị ha mmụọ otuto

nʼọnọdụ mmụọ ịda mba.

Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha,

dịka osisi ook siri ike,

igosi ịma mma Onyenwe anyị.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-04_23-13-58-