Pular para o conteúdo
Publicidade

Job 16

Okwu Job

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:

2 "Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a;

ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.

3 Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, naghị akwụsị?

Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?

4 Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu,

ma bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m;

enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu,

ma fufekwaa isi16:4 Ifufe isi nʼihu mmadụ, bụ omume nlelị anya. Ọ pụtara na e nweghị nsọpụrụ nʼebe onye dị otu a nọ. Abụ 22:7; Akw 2:15; Mat 27:39 m megide unu.

5 Ma ọnụ m ga-agba unu ume;

nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.

6 "Ma bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m,

bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?

7 Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m,

i tidakwala ezinaụlọ m.

8 I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m;

ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.

9 Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m,

na-atakwa ikikere eze ya megide m;

onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.

10 Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị,

ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo,

jikọtakwa onwe ha megide m.

11 Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume,

tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.

12 Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m.

O jidere m nʼolu ma tiwasịa m.

O meela m ihe ịgba ụta ya;

13 ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu.

na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko

mee ka oluilu m wụsịa nʼala.

14 Mgbe niile, na-emegide m;

na-achụso m dịka dike nʼagha.

15 "Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m,

liekwa ikuanya16:15 Maọbụ, mpi m nʼime ntụ.

16 Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa,

onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;

17 ma aka m emeghị ihe ike ọbụla,

ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.

18 "Ala, biko, ezokwala ọbara m;

mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!

19 bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe,

onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.

20 Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m,

dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.

21 Nʼọnọdụ mmadụ ka na-arịọ Chineke

dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.

22 "Naanị afọ ole na ole ga-agabiga

tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também