Pular para o conteúdo
Publicidade

Job 8

Okwu Bildad

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:

2 "Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a?

Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.

3 Chineke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi?

Onye pụrụ ime ihe niile na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?

4 Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya,

o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.

5 Ma bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike,

rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,

6 bụrụ na bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi,

bụladị ugbu a, ga-agbachitere gị

weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.

7 bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala,

ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.

8 "Jụọ ọgbọ ndị gara aga

ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.

9 Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị dịghị ihe ha maara.

Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.

10 bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe?

bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?

11 Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị?

Ahịhịa riidi ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?

12 Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha,

ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.

13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke,

otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.

14 Ihe tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa;

ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.

15 bụrụ na dabere na ya, ga-etibi;

bụrụ na o jide ya aka, ga-adọbikwa.

16 dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị,

nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.

17 Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ,

ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.

18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya,

ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, Ahụtụbeghị m gị.

19 Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ,

site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.

20 "Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ,

maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.

21 ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị.

ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.

22 Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe,

ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também