12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?
Olee kwa ebe nghọta bi?
13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,
agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
14 Ogbu mmiri na-asị, "Ọ dịghị nʼime m,"
osimiri na-asị, "Ọ dịghị nʼaka m."
15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,
apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,
a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,
maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị;
ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;
a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
20 Olee ebe amamihe si abịa?
Olee ebe nghọta bi?
21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,
e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
22 Mbibi na ọnwụ na-asị;
"Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị."