Pular para o conteúdo
Publicidade

Jó 28

12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe?

Olee kwa ebe nghọta bi?

13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya,

agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.

14 Ogbu mmiri na-asị, "dịghị nʼime m,"

osimiri na-asị, "dịghị nʼaka m."

15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya,

apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.

16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya,

a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,

17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya,

maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.

18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe dị;

ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.

19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya;

a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.

20 Olee ebe amamihe si abịa?

Olee ebe nghọta bi?

21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ,

e kpuchikwara ya nye bụladị anụ ufe nke eluigwe.

22 Mbibi na ọnwụ na-asị;

"Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị."

Veja também