Okwu mmalite
1 Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz.1:1 Job abụghị onye Izrel, kama ọ bụ onye Uz, obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Jer 25:20 Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ. 2 Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ. 3 O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.