21 kwuo sị:
"Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta
nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa.
Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile,
ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi."
22 Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.