4 "Ebee ka ị nọ mgbe m tọrọ ntọala ụwa?
Gwa m ma ọ bụrụ na ị ghọtara.
5 Onye kpebiri ihe ụwa ga-aha ka ya? Nʼezie ị maara,
onye setịrị ihe ọtụtụ e ji tụọ ya nʼelu ya?
6 Nʼelu gịnị ka a tọrọ ntọala ya,
onye doro nkume mbụ e ji tọọ ntọala ya?
7 Mgbe kpakpando nke isi ụtụtụ zukọrọ bụọ abụ,
ụmụ Chineke niile tisikwara mkpu ọṅụ ike?
8 "Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe38:8 Abụ 33:7; Abụ 104:9; Ilu 8:29; Jer 5:22
mgbe o nupụtara dịka a ga-asị na o si nʼakpanwa pụta,
9 mgbe m yikwasịrị ha igwe ojii dịka uwe,
werekwa ọchịchịrị meere ya akwa okike,
10 mgbe m kpaara ya oke ebe ọ ga-akwụsị,
tinye ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ya,
11 mgbe m sịrị, ‘Ruo ebe a ka ị ga-asọrute, ị gaghị agabiga ya,
nʼebe a ka a ga-akwụsị ebili mmiri mpako gị’?