Publicidade

Jó 4

Okwu Elifaz

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye obodo Teman zara Job sị:

2 "Iwe ga-ewe gị ma bụrụ na mmadụ agwa gị okwu?

Onye kwanụ nwere ike ịnọ nʼebe a hapụ ikwu okwu?

3 Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,

na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume.

4 Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,

bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji.

5 Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, bụrụla onye na-ada mba;

nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.

6 Egwu na-atụ Chineke gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,

izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị?

7 "Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?

Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?

8 Dịka m si hụ ya, ndị na-agha ajọ ihe dịka mkpụrụ na ndị na-akụ okwu na ụka

na-aghọta ya dịka ihe ubi.

9 Chineke na-ala ha nʼiyi site nʼume na-ekupụta.

na-esitekwa nʼoke iwe ya repịa ha.

10 Ọdụm nwere ike gbọọ ụja, maọbụ bigbọọ,

ma eze ọdụm dị ike ka a gbajisiri.

11 Oke ọdụm na-ala nʼiyi site na-enweghị ihe dọgbutara,

ụmụ nne ọdụm niile ka a na-achụsa.

12 "E mere ka okwu rute m nʼụzọ nzuzo,

ntị m nụrụ ya nʼịgba izu.

13 Nʼime nkụja nke oke nrọ nke abalị,

mgbe oke ụra na-adakwasị ụmụ mmadụ,

14 oke ụjọ na ahụ ịma jijiji dakwasịrị m,

meekwa ka ọkpụkpụ niile dị nʼahụ m maa jijiji.

15 Otu mmụọ sitere nʼihu m gafee.

bụladị ajị dị m nʼahụ guzochara ọtọ nʼihi ụjọ.

16 kwụsịrị;

ma apụghị m ịkọ ihe bụ.

Onyinyo guzooro nʼanya m,

anụrụ m olu dị nro, nke kwuru sị:

17 Mmadụ efu nwere ike bụrụ onye ezi omume karịa Chineke?

bụladị nwoke dị ike, pụrụ ịdị ọcha nʼobi karịa Onye kere ya?

18 bụrụ na Chineke adịghị atụkwasị ndị ozi ya obi,

bụrụ na na-ebo ndị mmụọ ozi ya ebubo imejọ ihe,

19 ga-esi aṅaa ghara ibo ndị bi nʼụlọ ụrọ ebubo karịa,

bụ ndị ntọala ha dị nʼaja,

ndị nke a na-azọpịa ngwangwa dịka nla.

20 Site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, a na-etipịasị ha:

ha na-ala nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi, ihe niile a na-agakwa dịka o si aga.

21 bụ na-eholiteghị eriri ụlọ ikwu ha elu,

mee ka ha nwụọ na-enweghị amamihe?

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-04_23-13-58-