6 Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;
mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m.
7 Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,
nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.
8 Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,
anya m site na anya mmiri akwa,
napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,
9 ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị
nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi.