Chineke onye na-echebe ndị ya
1 Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn
nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
2 Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,
otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu
ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.