3 Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m,
i letala m nʼabalị, nwalekwaa m,
ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere,
na ọnụ m ekwuhiebeghị.
4 Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị
ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta
nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.
5 Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị,
ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.