9 Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,
ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,
ha niile bụkwa ihe ziri ezi.
10 Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo,
karịa ọlaedo a nụchara anụcha;
ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,
karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
11 Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị;
ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.