7 Nʼihi na eze na-atụkwasị Onyenwe anyị obi,
agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya
nke Onye kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.
8 Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile;
aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.
9 Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ,
ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.
Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha,
ọkụ ya ga-erepịakwa ha.