3 Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị?
Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
4 Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha,
onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị,
maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.
5 Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị,
natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.