Publicidade

Salmos 3

Ekpere maka enyemaka

1 O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.

2 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,

"Chineke agaghị azọpụta ya." Sela

3 Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;

I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.

4 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,

nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela

5 Edinara m ala, hie ụra,

ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.

6 A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,

agaghị m atụ egwu ọbụla.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-