Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 3

Ekpere maka enyemaka

1 O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.

2 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,

"Chineke agaghị azọpụta ya." Sela3:2 Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme

3 Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;

I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.

4 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,

nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela

5 Edinara m ala, hie ụra,

ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.

6 A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,

agaghị m atụ egwu ọbụla.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também