Abụ mgbapụta
1 Aga m eto gị, O Onyenwe anyị,
nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m.
I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị.
2 O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka,
ị gwọkwara m.
3 O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m,
i mere ka m dịrị ndụ.