Oge m dị gị nʼaka
1 Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;
ekwela ka ihere mee m;
site nʼezi omume gị gbapụta m.
2 Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,
bịa ngwangwa gbapụta m;
ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,
ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.
3 Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,
nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.
4 Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m,
nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.
5 Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m;
gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.