12 Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya,
ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,
13 chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,
chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.
14 Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,
chọọ udo ma gbasookwa ya.