2 Sachapụ mmehie m niile,51:2 Aịz 43:25; Aịz 44:22; Kọl 2:14.
ma mee m ka m dị ọcha.
3 Nʼihi na amaara m njehie m niile,
mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,
mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,
nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu,
na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe.