Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 51

7 Were hisọp51:7 Nʼoge mmemme idebe ihe ọcha, ọ bụ ahịhịa hisọp ka a na-eji efesa ọbara. sachaa m, aga m adị ọcha;

sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.

8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;

ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.

9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,

hichapụkwa mmehie m niile.

10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,

nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.

11 Achụpụla m nʼihu gị,

anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị.

12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,

ma jiri ezi mmụọ kwagide m.

Veja também