12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,
apụrụ m ịnagide ya;
a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m,
apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.
13 Maọbụ gị, nwoke dịka m,
onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,
14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ,
nʼụlọ Chineke,
ka anyị na-ejegharị
nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.