5 O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke;
olileanya m na-esite na ya na-abịa.
6 Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m.
Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m.
7 Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,62:7 Maọbụ, Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ nzọpụta m na ugwu m
Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m.
8 Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ;
kwupụtaranụ ya obi unu,
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. Sela