Abụ ekele
1 Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke!
2 Bụọ abụ banyere ebube aha ya;
meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube!
3 Gwa Chineke okwu sị ya, "Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu!
Ike gị dị nnọọ ukwu,
ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ.
4 Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị;
ha na-abụku gị abụ otuto,
ha na-abụ abụ otuto nye aha gị." Sela