23 Nʼagbanyeghị ihe ndị a, o nyere mbara eluigwe iwu
meghekwa ọnụ ụzọ niile nke eluigwe.
24 O mere ka mánà zokwasị ndị mmadụ a dịka mmiri, ka ha rie.
O nyere ha mkpụrụ ọka nke si nʼeluigwe.
25 Ndị mmadụ tara achịcha ndị mmụọ ozi.
O zitere ha nri niile ha nwere ike iri.