Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 10

Arịrịọ maka ikpe ziri ezi

1 Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?

Gịnị mere na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?

2 Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,

ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.

3 na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,

na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.

4 Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,

nʼechiche ya niile, naghị eche banyere ya.

5 Ma ihe niile na-eme na-agara ya nke ọma;

bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe nọ;

na-elelị ndị iro ya niile.

6 Nʼime obi ya, na-asị, "dịghị ihe ga-emetụta m.

Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m."10:6 Ọ na-asị nʼime obi ya, "Agaghị ewezuga m nʼọnọdụ m"; Ọ na-aṅụkwa iyi sị, "Ọ dịghị onye ọbụla ga-eme m ihe ọjọọ"

7 Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,10:7 Ya bụ, ịgba iyi

nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.

8 Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,

nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ,

na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.

9 Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,

na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye.

Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.

10 Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya,

na-azọpịakwa ha.

11 Nʼime obi ya, na-asị, "Chineke echefuola.

O zofuola ihu ya, dịghị mgbe hụrụ ya."10:11 O mechiri anya ya, ọ naghị ahụ ya

12 Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị,

echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.

13 Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?

Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya,

"gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m"?

14 Ma gị, O Chineke, na-ahụ nsogbu na ihe mwute,

na-atule ihe ga-eme banyere ha.

Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi,

nʼihi na bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.

15 Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,

kpọọ ya ka zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile

nke a na-apụghị ịchọpụta.

16 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.

ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.

17 O Onyenwe anyị, maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;

na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,

18 na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,

ka mmadụ efu, onye e kere eke,

ghara imenye ha egwu ọzọ.

Veja também