Publicidade

Salmos 102

Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu Onyenwe anyị.

Arịrịọ maka ime ebere

1 Nụrụ ekpere m, O Onyenwe anyị;

ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị.

2 Ezonarịla m ihu gị

nʼụbọchị nsogbu m.

Gee ntị nʼekpere m,

zakwaa m ngwangwa.

3 Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ;

ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ.

4 Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa;

ana m echefu iri nri m.

5 Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ,

enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.

6 Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara,

a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị.

7 Ana m amụ anya abalị niile;

adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ.

8 Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị;

ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ.

9 Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m,

anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m

10 nʼihi oke iwe gị,

i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.

11 Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada.

Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa.

12 Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi;

aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

13 ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ,

nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola;

oge ahụ a kara aka eruola.

14 Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị;

mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere.

15 Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị,

ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.

16 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ewugharị Zayọn,

ga-apụta ihe nʼebube ya.

17 ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa;

gaghị eleda arịrịọ ha anya.

18 Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu,

ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too Onyenwe anyị:

19 "Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya,

o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa,

20 ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ

na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ."

21 Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha Onyenwe anyị na Zayọn;

a ga-eto ya na Jerusalem,

22 mgbe mba niile na alaeze niile,

ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe.

23 O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m;

o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.

24 Nʼihi ya, ekwuru m sị,

"Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ;

na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

25 Na mmalite, tọrọ ntọala ụwa,

eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.

26 Ha ga-ala nʼiyi, ma ga-adịgide;

ha ga-erichasị dịka akwa ochie.

ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya,

ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga.

27 Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,102:27 Aịz 41:1; Aịz 43:10; Mal 3:6; Hib 13:8; Jem 1:17

ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ.

28 Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide;

ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị."

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_12-11-46-