8 Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.
Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.
9 Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta;
10 ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị,
ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.
11 Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,
otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.
12 Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ,
otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.