Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 103

8 Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara.

dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya.

9 Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

bụghị oge niile ka na-anọgide na-ata mmadụ ụta;

10 bụghị dịka mmehie anyị si dị ka na-emeso anyị,

dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.

11 Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,

otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.

12 Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ,

otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.

Veja também