Abụ nke dike nʼagha
1 Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m,
onye na-ezi aka m abụọ ibu agha,
na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.
2 Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike,
ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m,
ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya,
onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.