3 Atụkwasịla ụmụ eze obi gị,
ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.
4 Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja146:4 Ekl 12:7;
nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.
5 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb,
onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.