Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 19

Akaọrụ Chineke na iwu ya

1 Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke;

mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.

2 Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu,

ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.

3 Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,

ma a na-anụ ụda ha.

4 Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,

okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.

bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.

5 dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,

dịka ọgba ọsọ nke na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.

6 na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,

bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.

dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.

7 Iwu Onyenwe anyị zuruoke;

na-eweghachi mkpụrụobi.

Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;

na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.

8 Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,

na-enye mkpụrụobi ọṅụ.

Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,

na-enye anya ìhè.

Veja também