Akaọrụ Chineke na iwu ya
1 Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke;
mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.
2 Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu,
ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.
3 Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,
ma a na-anụ ụda ha.
4 Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,
okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.
Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
5 Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,
dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.
6 Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,
bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.
Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.
7 Iwu Onyenwe anyị zuruoke;
ọ na-eweghachi mkpụrụobi.
Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;
ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.
8 Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,
ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ.
Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,
ọ na-enye anya ìhè.