Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 20

Ekpere maka enyemaka

1 Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;

ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.

2 Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,

ma site na Zayọn kwagide gị.

3 Ya chetakwa aja niile chụrụ,

ma nabata aja nsure ọkụ niile chụrụ nye ya. Sela

4 Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,

mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também