Ekpere maka enyemaka
1 Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;
ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.
2 Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,
ma site na Zayọn kwagide gị.
3 Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela
4 Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.