Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ
1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
2 Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
3 ọ na-atụte mkpụrụobi m.
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume
nʼihi aha ya.