Nkwupụta na mgbaghara mmehie
1 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,
onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,
onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
2 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,
onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
3 Mgbe m gbachiri nkịtị,
ọkpụkpụ m rere ure
site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
4 Ehihie niile na abalị niile,
ị tara m ahụhụ,
ume dị m nʼobi gwụchara,
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.32:4 Mgbe anwụ na-amịkọrọ mmiri dị nʼala Sela
5 Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,
kwụsịkwa izo ha ezo.
Agwara m onwe m okwu sị,
"Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị."
Ị gbaghakwaara m
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
6 Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha.