Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 32

Nkwupụta na mgbaghara mmehie

1 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,

onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,

onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.

2 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,

onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,

onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.

3 Mgbe m gbachiri nkịtị,

ọkpụkpụ m rere ure

site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.

4 Ehihie niile na abalị niile,

tara m ahụhụ,

ume dị m nʼobi gwụchara,

dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.32:4 Mgbe anwụ na-amịkọrọ mmiri dị nʼala Sela

5 Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,

kwụsịkwa izo ha ezo.

Agwara m onwe m okwu sị,

"Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị."

gbaghakwaara m

ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela

6 Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere

mgbe e nwere ike ịchọta gị;

nʼụzọ dị otu a, bụrụ na uju mmiri abịa,

gaghị erute ha.

Veja também