Ịdị mma na ịdị ukwuu Onyenwe anyị
1 Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;
nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.
2 Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;
werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.
3 Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;
were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.