4 "O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m
na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile;
mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.
5 I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta;
ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị.
Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume
ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela
6 "Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo
nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ,
na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.