Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 46

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

1 Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka bụ nʼoge nsogbu.

2 Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,

maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.

3 Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,

maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também