11 Ma mee ka onye ọbụla na-agbaba nʼime gị ṅụrịa;
mee ka ha nọgide na-eti mkpu ọṅụ.
Were aka nchebe gị kpuchie ha,
ka ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ṅụrịa ọṅụ nʼime gị.
12 Nʼezie, O Onyenwe anyị, ị na-agọzi onye ezi omume.
Ị na-eji ihuọma gị gbaa ha gburugburu dịka ọta.