5 Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha,
onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
6 Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ,
ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ,
ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.