4 Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,
kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu
akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,
na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.
5 O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,
mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel,
bụ nke ọ dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị,
ka ha kuziere ụmụ ha,
6 ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,
ọ bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị,
ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.
7 Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,
ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche.
Ha ga-edebekwa iwu ya niile.