Publicidade

Salmos 78

4 Anyị agaghị ezonarị ụmụ anyị ihe ndị a,

kama anyị ga-akọrọ ọgbọ nke na-abịa nʼihu

akụkọ ịdị ike Onyenwe anyị,

na ọrụ ebube ya, na ihe ịtụnanya niile o mere.

5 O nyere Jekọb iwu banyere ụkpụrụ ya,

mekwaa ka iwu ahụ guzosie ike nʼIzrel,

bụ nke dọrọ nna nna anyị ha aka na ntị,

ka ha kuziere ụmụ ha,

6 ka ọgbọ na-eso ha nwee ike mụta ya,

bụladị ọgbọ nke a ka amụbeghị,

ndị nke ga-agwakwa ha ụmụ ha.

7 Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi ha,

ma ghara ichefu ọrụ ya niile dị iche iche.

Ha ga-edebekwa iwu ya niile.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-