1 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,
bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.
2 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;
kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.
3 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,
kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.
4 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;
onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.
5 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,
maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.
6 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;
ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.
7 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.
8 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya;
werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.
9 Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya;
maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.