Publicidade

Salmos 96

Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị

1 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,

bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.

2 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;

kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.

3 Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,

kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.

4 Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;

onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka bụkwa.

5 Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,

maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.

6 Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;

ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.

7 Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,

nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.

8 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya;

werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.

9 Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya;

maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-