Gọzie Onyenwe anyị
1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.
2 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;
echefukwala mmeso ọma ya niile,
3 ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;
na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,
4 onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu
werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,