Pular para o conteúdo
Publicidade

Abụ Ọma 103

Gọzie Onyenwe anyị

1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya.

2 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị;

echefukwala mmeso ọma ya niile,

3 bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile;

na-agwọkwa gị ọrịa gị niile,

4 onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu

werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze,

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também