9 Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ?
Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.
10 Eji m obi m niile na-achọsi gị ike.
Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
11 Ezoola m okwu gị niile nʼobi m,
igbochi m imehie imegide gị.
12 Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị;
kuziere m iwu gị niile.
13 Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa
iwu niile nke si nʼọnụ gị.
14 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile
dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.
15 Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị
na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile.
16 Iwu gị na-amasị m;
agaghị m elefu okwu gị anya.
ג Gimel