13 Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile
na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
14 Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada
na-akwagide ndị niile dara mba.