8 Jiri aka gị tulee ma hụkwa na Onyenwe anyị dị mma;
onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya.
9 Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya,
nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.
10 Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha,
ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.
11 Ụmụ m, bịanụ gee m ntị;
aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.