6 Atụkwasịghị m obi m nʼụta m,
mma agha m anaghị enye m mmeri;
7 ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ,
ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.
8 Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile,
anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela