Publicidade

Salmos 51

4 bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,

mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,

nke mere na bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe na-ekwu okwu,

na onye ezi omume mgbe na-ekpe ikpe.

5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m;

bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.

6 Nʼezie, na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo;

na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo.

7 Were hisọp51:7 Nʼoge mmemme idebe ihe ọcha, ọ bụ ahịhịa hisọp ka a na-eji efesa ọbara. sachaa m, aga m adị ọcha;

sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo.

8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;

ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa.

9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,

hichapụkwa mmehie m niile.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-