Pular para o conteúdo
Publicidade

Salmos 139

Chineke maara ihe niile

1 O Onyenwe anyị, nyochaala m,

makwaara m nke ọma

2 maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ;

site nʼebe dị anya, na-aghọta echiche obi m niile.

3 na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m;

mazukwara ụzọ m niile.

4 O Onyenwe anyị, maara ihe m gaje ikwu

tupu m kwuo ya.

Veja também